19 N’ihi na ọ bụ ákwá arịrị ka a nụrụ site na Zayọn, sị:+ “Lee otú e si bukọrọ ihe anyị nwere!+ Lee otú ihere si mee anyị! N’ihi na anyị ahapụwo ala anyị; n’ihi na ha akụtuwo ebe obibi anyị.”+
29 Ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso obodo a agha, ga-abata mụnye obodo a ọkụ wee gbaa ya ọkụ,+ tinyere ụlọ ndị dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ha nọ na-esurere Bel ihe nsure ọkụ, na-awụsakwara chi ọzọ dị iche iche àjà ihe ọṅụṅụ iji kpasuo m iwe.’+