39 “Ị ga-eji ezigbo eri linin* kwee uwe mwụda tụrụ àgwà ma were ezigbo eri linin mee ákwà a na-eke n’isi,+ ị ga-emekwa ákwà a na-eke n’úkwù,+ nke onye na-ekwe ákwà ga-ekwe.
4 Ọ ga-eyiri uwe mwụda dị nsọ nke e ji ákwà linin mee,+ ọ ga-eyirikwa uwe úkwù e ji linin mee,+ ọ ga-eke ákwà e ji linin mee n’úkwù+ ma kee ákwà e ji linin mee n’isi.+ Ha bụ uwe dị nsọ.+ Ọ ga-asa ahụ́ na mmiri+ wee yiri ha.