23 Mgbe Jehova ga-agabiga ịga tie ndị Ijipt ihe otiti wee hụ ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ nakwa n’awara ya abụọ, Jehova ga-agabiga ọnụ ụzọ ahụ, ọ gaghị ekwe ka mbibi ahụ rute n’ụlọ unu wee tie unu ihe otiti.+
18 Lee! Anyị ga-abata n’ala a. Ị ga-ekegide eriri uhie a na windo a i mere ka anyị si na ya rịdata, ị ga-akpọkọtakwa nna gị na nne gị na ụmụnne gị na ndị ezinụlọ nna gị dum n’ụlọ a ị nọ.+
4 A gwakwara ha ka ha ghara ibibi ahịhịa ndụ ndị dị n’ụwa ma ọ bụ ihe ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ osisi ọ bụla, kama ka ha mekpaa naanị ndị mmadụ na-enweghị akara nke Chineke n’egedege ihu ha+ ahụ́.