16 Ma ha ji ndị ozi nke ezi Chineke na-eme ihe ọchị,+ na-eledakwa okwu ya anya+ ma na-akwa+ ndị amụma ya emo, ruo mgbe ọnụma+ Jehova bịakwasịrị ndị ya, ruo mgbe ọ na-enweghị ihe ga-egbochi ya.+
13 Ebe ọ bụ na unu nọ na-eme ihe ndị a,’ ka Jehova kwuru, ‘mụ onwe m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu,+ ma unu egeghị ntị,+ m nọkwa na-akpọ unu òkù, ma unu azaghị,+