13 Ya mere, a ga-adọrọ ndị m n’agha n’ihi enweghị ihe ọmụma;+ agụụ ga-agụgbukwa ndị ha dị ebube,+ akpịrị ga-akpọsikwa ìgwè mmadụ nọ n’etiti ha nkụ ike.+
22 N’ihi na ndị m dị nzuzu.+ Ha amaghị m.+ Ha bụ ụmụ na-amaghị ihe; ha abụghị ndị nwere nghọta.+ Ha bụ ndị maara ihe n’ime ihe ọjọọ, ma n’ime ihe ọma, ha bụ ndị na-amaghị ihe.+