27 Ha na-asị osisi, ‘Ị bụ nna m,’+ sịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ma, ọ bụ m ka ha gbakụtara azụ, ha echeghị ihu n’ebe m nọ.+ Mgbe ọdachi dakwasịrị ha, ha ga-asị, ‘Bilie zọpụta anyị!’+
19 “‘Ahụhụ ga-adịrị onye na-asị mkpirisi osisi: “Teta!” onye na-asịkwa nkume na-apụghị ikwu okwu: “Teta! Ya onwe ya ga-enye ntụziaka”!+ Lee! E ji ọlaedo na ọlaọcha machie ya,+ ume ndụ ọ bụla adịghị n’ime ya.+