33 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ada bụ́ Babịlọn dị ka ebe nzọcha mkpụrụ.+ Oge eruwo ka a zọsie ya ụkwụ ike. Ma, ọ fọrọ ntakịrị ka oge a ga-ewe ya dị ka ihe ubi ruo.”+
18 Mmụọ ozi ọzọ wee si n’ebe ịchụàjà ahụ pụta, o nwekwara ikike n’ebe ọkụ dị.+ O wee jiri oké olu gwa nke ahụ ji mma owuwe ihe ubi, sị: “Tinye mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ ma ghọọ ụyọkọ mkpụrụ vaịn nke ụwa,+ n’ihi na mkpụrụ ya achawo acha.”