36 Unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ,+ unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esure n’ọkụ. Ọ bụ nzukọ ukwu. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.
18 A nọkwa na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ iwu nke ezi Chineke kwa ụbọchị n’olu dara ụda,+ malite n’ụbọchị mbụ ruo n’ụbọchị ikpeazụ; ha wee na-eme ememme ahụ ruo ụbọchị asaa, n’ụbọchị nke asatọ, e nwere nzukọ ukwu dị ka e kwuru n’iwu.+