38 ekpere+ ọ bụla onye ọ bụla ma ọ bụ ndị gị niile bụ́ Izrel+ ga-ekpe ma ọ bụ arịrịọ ọ bụla ha ga-arịọ ka i meere ha amara,+ n’ihi na onye ọ bụla n’ime ha maara ihe na-egbu ya mgbu n’obi,+ ha ewee gbasapụ ọbụ aka ha chee n’ebe ụlọ a dị,+
38 ha ewee nọrọ n’ala ebe ndị dọọrọ ha n’agha ji ha eji+ wee jiri obi ha dum+ na mkpụrụ obi ha dum lọghachikwute gị, ha ewee chee ihu n’ala ha bụ́ nke i nyere ndị nna nna ha, nakwa n’obodo ị họọrọ,+ nakwa n’ụlọ a m wuuru aha gị,+ kpekuo gị ekpere;