10 M ga-ebipụ ụgbọ ịnyịnya agha n’Ifrem, bipụkwa ịnyịnya na Jeruselem.+ A ga-ebibikwa ụta agha.+ Ọ ga-agwa mba dị iche iche okwu udo;+ ọchịchị ya ga-esi n’oké osimiri ruo n’oké osimiri, sikwa n’osimiri Yufretis ruo na nsọtụ ụwa.+
15 Mmụọ ozi nke asaa wee fụọ opi ya.+ Oké olu wee kwuo okwu n’eluigwe, sị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị+ na nke Kraịst ya,+ ọ ga-achịkwa dị ka eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”+