Abụ Ọma
Banyere Sọlọmọn.
2 Ka o jiri ezi omume kpechite ọnụ ndị gị,+
Ka o jirikwa ikpe ziri ezi kpechite ọnụ ndị gị nọ n’ahụhụ.+
4 Ka o kpechitere ndị nọ n’ahụhụ n’etiti ndị gị ọnụ ha,+
Ka ọ zọpụta ụmụ onye ogbenye,
Ka o gwepịakwa onye nrigbu.
5 Ha ga na-atụ egwu gị ogologo oge niile anyanwụ dị,+
Nakwa ogologo oge niile ọnwa dị, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
6 Ọ ga-agbadata dị ka mmiri ozuzo si ezokwasị ahịhịa a sụrụ asụ,+
Dị ka oké mmiri ozuzo nke na-ede ala.+
7 N’oge ọchịchị ya, onye ezi omume ga na-ama pokopoko,+
Udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị.+
10 Ndị eze Tashish na ndị eze agwaetiti dị iche iche+—
Ha ga-atụ ụtụ.+
Ndị eze Shiba na ndị eze Siba—
Ha ga-eweta onyinye.+
12 N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka,+
Nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka.+
13 Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere,+
Ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye.+
15 Ya dịrị ndụ,+ ka e nyekwa ya ụfọdụ n’ime ọlaedo Shiba.+
Ka a na-ekpekwa ekpere n’ihi ya mgbe niile;
Ka ọ bụrụ onye a gọziri agọzi ogologo ụbọchị dum.+
Ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.+
Mkpụrụ ya ga na-eme nke ọma dị ka osisi ndị dị na Lebanọn,+
Ndị nọ n’obodo ya ga na-ama pokopoko dị ka ihe a kụrụ n’ala.+
17 Ka aha ya dịruo mgbe ebighị ebi;+
Ka aha ya dị ukwuu ruo ogologo oge niile anyanwụ dị,
Ka ha site n’aka ya gọzie onwe ha;+
Ka mba niile kpọọ ya onye obi ụtọ.+
18 Ka Jehova Chineke, bụ́ Chineke Izrel, bụrụ onye a gọziri agọzi,+
Onye naanị ya na-arụ ọrụ dị ebube.+