42 Ma ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri+ nke mkpá akwụkwọ mint na mkpá akwụkwọ ruu na nke akwụkwọ nri ọ bụla ọzọ, ma ikpe ziri ezi na ịhụ Chineke n’anya ka unu na-eleghara anya! Unu ji ụgwọ ime ihe ndị a, ma unu agaghị ahapụ ime ihe ndị ọzọ ahụ.+