26 “Gwa ndị Livaị okwu, sị ha, ‘Unu ga-anara ụmụ Izrel otu ụzọ n’ụzọ iri m nyere unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu,+ unu ga-esikwa na ya nye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ụzọ n’ụzọ iri+ ahụ ka ọ bụrụ onyinye.
6 Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà nsure ọkụ+ unu na àjà nkịtị unu na otu ụzọ n’ụzọ iri+ unu na onyinye unu na-eweta+ na onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu na anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi unu nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ+ unu.
5 Ozugbo a kpọsara okwu ahụ, ụmụ Izrel+ wetakwuru ọka,*+ mmanya ọhụrụ+ na mmanụ+ na mmanụ aṅụ,+ bụ́ ndị si ná mkpụrụ mbụ ha, tinyere mkpụrụ niile si n’ubi.+ Ha wetakwara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile n’ụba.+
10 Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile+ n’ụlọ nkwakọba ihe m, ka nri wee dịrị n’ụlọ m;+ biko, nwaleenụ m n’ihe a,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “ma ḿ gaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe+ wee wụsa unu ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ unu.”+
42 Ma ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri+ nke mkpá akwụkwọ mint na mkpá akwụkwọ ruu na nke akwụkwọ nri ọ bụla ọzọ, ma ikpe ziri ezi na ịhụ Chineke n’anya ka unu na-eleghara anya! Unu ji ụgwọ ime ihe ndị a, ma unu agaghị ahapụ ime ihe ndị ọzọ ahụ.+
5 N’eziokwu, e nyere ụmụ nwoke ndị bụ́ ụmụ Livaị,+ ndị na-anata ọrụ ịbụ ndị nchụàjà iwu ka ha na-anata ndị Izrel,+ ya bụ, ụmụnne ha, otu ụzọ n’ụzọ iri+ dị ka Iwu ahụ si dị, ọ bụrụgodị na ndị a sitere n’úkwù Ebreham;+