-
Nehemaya 10:37Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
37 Ntụ ọka+ nke si ná mkpụrụ mbụ anyị na onyinye+ anyị na mkpụrụ nke ụdị osisi niile,+ mmanya ọhụrụ+ na mmanụ+ ka anyị ga-ebutekwara ndị nchụàjà n’ebe a na-eri ihe+ n’ụlọ Chineke anyị, nyekwa ndị Livaị+ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ala anyị mepụtara, ebe ọ bụ na ha, bụ́ ndị Livaị, bụ ndị na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri n’obodo anyị dị iche iche a na-akọ ugbo.
-
-
Nehemaya 12:44Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
44 N’ụbọchị ahụ, a họpụtakwara ndị ikom ga na-elekọta ụlọ+ a na-akwakọba ihe+ e nyere n’onyinye,+ mkpụrụ mbụ+ na otu ụzọ n’ụzọ iri.+ N’ime ụlọ ndị ahụ ka ha ga na-akwakọba ihe e si n’ubi ndị dị n’obodo dị iche iche wepụta, bụ́ ihe iwu+ kwuru ka a na-enye ndị nchụàjà na ndị Livaị;+ n’ihi na ọṅụ Juda na-aṅụrị bụ n’ihi ndị nchụàjà na ndị Livaị+ ndị nọ na-eje ozi.
-