14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
8 O wee sị: “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu;+ n’ihi na ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Ọ bụ m bụ ya,’ sịkwa, ‘Oge ahụ a kara aka eruwo.’+ Unu esola ha.
8 Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu+ unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma+ na aghụghọ efu,+ dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ+ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị;
3 Unu ekwela ka onye ọ bụla rafuo unu n’ụzọ ọ bụla, n’ihi na ọ gaghị abịa ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ nwee ndapụ n’ezi ofufe,+ e kpugheekwa+ onye ahụ na-emebi iwu,+ nke bụ́ nwa mbibi.+