2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.
3 ma okwu ọ bụla nke si n’aka mmụọ, nke na-adịghị ekwupụta Jizọs, esighị n’aka Chineke.+ Ọ bụ ya bụ okwu si n’aka mmụọ nke onye ahụ na-emegide Kraịst, onye unu nụrụ na ọ na-abịa,+ ugbu a, ọ nọrọlarị n’ụwa.+