Diuterọnọmi 8:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 O wee zụọ gị ka ị dị umeala ma mee ka agụụ+ gụọ gị wee nye gị mana,+ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna gị hà na-amaghị; iji mee ka ị mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta ga-eme ka mmadụ dị ndụ.+ Luk 4:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ma Jizọs zara ya, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ.’”+ Jọn 4:34 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 34 Jizọs sịrị ha: “Ihe oriri m+ bụ ka m mee uche+ onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.+
3 O wee zụọ gị ka ị dị umeala ma mee ka agụụ+ gụọ gị wee nye gị mana,+ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna gị hà na-amaghị; iji mee ka ị mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta ga-eme ka mmadụ dị ndụ.+