7 Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+
32 Ma akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ọ na-agụpụta bụ nke a: “Dị ka atụrụ, a kpụtara ya n’ebe a ga-egbu ya, dịkwa ka nwa atụrụ na-adịghị ekwu okwu n’ihu onye na-akpacha ya ajị, otú ahụ ka ọ na-adịghị emepe ọnụ ya.+