48 O yiri mmadụ nke na-ewu ụlọ, bụ́ onye gwuru ala gwumie ya egwumi, tọọkwa ntọala n’elu oké nkume. Ya mere, mgbe e nwere idei mmiri,+ osimiri asọkwasịkwa ụlọ ahụ, ma o sirughị ike ime ka ọ maa jijiji, n’ihi na e wuru ya nke ọma.+
25 Ma onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè+ nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ+ n’ime ya eme, n’ihi na ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama ọ bụ onye na-arụ ọrụ ahụ.+