35 Ọ sịkwara ha: “Mgbe m zipụrụ+ unu, unu ewee gawa n’ejighị obere akpa ego na obere akpa nri na akpụkpọ ụkwụ, ọ dịghị ihe kọrọ unu, ka ọ̀ dị?” Ha wee sị: “Ee e!”
7 Olee onye jetụworo ozi dị ka onye agha site n’akpa nke ya onwe ya? Olee onye na-akọ ubi vaịn nke na-adịghị eri mkpụrụ ya?+ Ma ọ bụ, olee onye na-azụ anụ ụlọ nke na-adịghịkwa aṅụ mmiri ara nke si n’anụ ụlọ ahụ?+