31 A ga-akpọlite eze nwaanyị+ ndịda n’oge ikpe, ya na ndị ọgbọ a, ọ ga-ama ha ikpe; n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụrụ amamihe Sọlọmọn, ma, lee! onye ka Sọlọmọn+ nọ n’ebe a.
32 Ndị Ninive ga-ebili n’oge ikpe, ha na ọgbọ a, ha ga-amakwa ya ikpe; n’ihi na ha chegharịrị n’ihi ihe Jona kwusara;+ ma, lee! onye ka Jona+ nọ n’ebe a.