21 Jizọs zara ha, sị: “N’ezie, ana m asị unu, A sị nnọọ na unu nwere okwukwe ma ghara inwe obi abụọ,+ ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe m mere osisi fig a, kama, ọ bụrụ na unu asị ugwu a, ‘Ka e bulie gị tụba gị n’oké osimiri,’ ọ ga-eme.+
23 N’ezie, ana m asị unu na onye ọ bụla nke sịrị ugwu a, ‘Ka e bulie gị tụba gị n’oké osimiri,’ ọ bụrụkwa na o nweghị obi abụọ n’ime obi ya, kama nwee okwukwe na ihe o kwuru ga-eme, ọ ga-emere ya otú ahụ.+
6 Onyenwe anyị wee sị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-agwa osisi mọlberi ojii a, sị, ‘Ka e fopụ gị ma kụọ gị n’oké osimiri!’ ọ ga-erubekwara unu isi.+
2 Ọ bụrụkwa na m nwere onyinye ibu amụma,+ marakwa ihe nzuzo dị nsọ+ niile na ihe ọmụma niile,+ ọ bụrụkwa na m nwere okwukwe niile iji bupụ ugwu,+ ma enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ.+