33 Reenụ+ ihe unu nwere ma were ya nye onyinye ebere.+ Meerenụ onwe unu obere akpa ego ndị na-adịghị aka aka, bụ́ akụ̀ nke na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe,+ ebe onye ohi na-adịghị eru nso, ebe nla na-adịghịkwa erichapụ.
22 Mgbe Jizọs nụrụ ihe o kwuru, ọ sịrị ya: “Ọ dị otu ihe ị ka ga-eme: Ree ihe niile i nwere kesaara ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe; bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+