21 Jizọs legidere ya anya ma nwee ịhụnanya n’ebe ọ nọ wee sị ya: “Ọ dị otu ihe ị ka ga-eme: Gaa, ree ihe ndị i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe, bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+
33 Reenụ+ ihe unu nwere ma were ya nye onyinye ebere.+ Meerenụ onwe unu obere akpa ego ndị na-adịghị aka aka, bụ́ akụ̀ nke na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe,+ ebe onye ohi na-adịghị eru nso, ebe nla na-adịghịkwa erichapụ.
19 ka ha na-atọrọ+ onwe ha ezi ntọala+ maka ọdịnihu dị ka akụ̀ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme ya, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.+