35 Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.+
23 Mgbe ha kpagburu unu n’otu obodo, gbalaganụ n’obodo ọzọ;+ n’ihi na n’ezie, ana m asị unu, Unu agaghị agazu+ obodo ndị dị n’Izrel ma ọlị ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute.+