29 Onye ọ bụla nke hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu okpukpu, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.+
30 nke na-agaghị enweta ugbu a, n’ime oge a, okpukpu otu narị+ ụlọ na ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne na ụmụ na ubi, tinyere mkpagbu,+ nwetakwa ndụ ebighị ebi n’usoro ihe na-abịanụ.”
10 Atụla egwu banyere ihe ndị ị na-aga ịta ahụhụ ha.+ Lee! Ekwensu+ ga na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu,+ ka unu wee nweekwa mkpagbu+ ruo ụbọchị iri. Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ,+ m ga-enye gị okpueze bụ́ ndụ.+