10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
44 O wee sị ha: “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ,+ na ihe niile e dere n’iwu Mozis na n’Akwụkwọ Ndị Amụma+ na Abụ Ọma+ banyere m aghaghị imezu.”
45 Filip hụrụ Nataniel+ wee sị ya: “Anyị ahụwo onye ahụ Mozis dere banyere ya n’Iwu ahụ,+ onye Ndị Amụma+ dekwara banyere ya, ya bụ, Jizọs, nwa Josef,+ onye Nazaret.”
22 Otú ọ dị, n’ihi na m nwetara enyemaka+ si n’ebe Chineke nọ, anọ m na-agbara ma ndị nta ma ndị ukwu àmà ruo taa, ma adịghị m ekwu ihe ọ bụla ma e wezụga ihe Ndị Amụma+ na Mozis+ kwuru na ọ bụ ihe ga-eme,