31 Chineke buliri onye a elu ka ọ nọrọ n’aka nri ya+ dị ka Onye Nnọchiteanya Ukwu+ na Onye Nzọpụta,+ ka Izrel wee chegharịa,+ ka e wee gbaghara ha mmehie ha.+
10 N’ihi na o kwesịrị ekwesị ka onye ahụ nke ihe niile dị n’ihi ya,+ onye ihe niile sikwa n’aka ya dịrị, mee ka Onye Nnọchiteanya Ukwu+ nke nzọpụta ha zuo okè site n’ịta ahụhụ,+ mgbe Ọ na-eme ka ọtụtụ ụmụ nwee ebube.+