21 ka ha niile wee bụrụ otu,+ dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu,+ ka anyị na ha wee dị n’otu,+ ka ụwa wee kwere na ọ bụ gị zitere m.+
27 Ma na-akpanụ àgwà n’ụzọ kwesịrị+ ozi ọma banyere Kraịst, ka m wee nụ ihe banyere unu, ma m̀ bịara hụ unu ma ọ̀ bụ na mụ anọghị ya, na unu guzosiri ike n’otu mmụọ, jiri otu mkpụrụ obi+ na-agbakọ mbọ maka okwukwe nke sitere n’ozi ọma,