10 Ma m na-agba unu ume,+ ụmụnna m, site n’aha+ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu niile na-ekwu otu ihe,+ ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu,+ kama ka unu dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.+
28 E nweghịkwa onye Juu ma ọ bụ onye Grik,+ e nweghịkwa ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya,+ e nweghịkwa nwoke ma ọ bụ nwaanyị;+ n’ihi na unu niile bụ otu onye n’ime Kraịst Jizọs.+
7 Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’ìhè ahụ, dị ka ya onwe ya nọ n’ìhè ahụ,+ anyị na ibe anyị na-emekọrịta ihe,+ ọbara+ Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụ+ anyị mmehie niile.+