10 Ya mere, ana m enweta obi ụtọ n’adịghị ike, ná mkparị, n’ịnọ ná mkpa, ná mkpagbu na ihe isi ike, n’ihi Kraịst. N’ihi na mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.+
34 N’ihi na unu nwere obi ebere n’ebe ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ nọ, jirikwa ọṅụ nabata mbukọ e bukọọrọ+ ihe unu, ebe unu maara na unu onwe unu nwere ihe onwunwe ka mma, nke na-adịgidekwa adịgide.+
13 Kama nke ahụ, na-aṅụrịnụ ọṅụ,+ ebe unu bụ ndị na-eketa òkè n’ahụhụ nke Kraịst,+ ka unu wee ṅụrịa ọṅụ ma nwebigakwa ọṅụ ókè mgbe a ga-ekpughe+ ebube ya.