13 Ihe dị mma ọ̀ ghọziiri m ọnwụ? Tụfịakwa! Kama ọ bụ mmehie ghọọrọ m ọnwụ, ka e wee gosi na ọ bụ mmehie na-arụpụtara m ọnwụ site n’ihe dị mma;+ ka mmehie wee dị nnọọ njọ karị site n’ihe ahụ e nyere n’iwu.+
19 N’ihi gịnịzi ka e ji nwee Iwu ahụ? A tụkwasịrị ya iji mee ka mmebi iwu pụta ìhè,+ ruo mgbe mkpụrụ ahụ ga-abịarute,+ bụ́ onye e kwere nkwa ahụ; e sitekwara n’aka ndị mmụọ ozi+ nye ya, site n’aka onye ogbugbo.+