15 Gbalịsie ike ka i chee onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye ihe ya dị ya mma,+ onye ọrụ+ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere,+ onye na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.+
12 Obi ụtọ na-adịrị onye na-atachi obi n’ọnwụnwa,+ n’ihi na mgbe a nwapụtara ya, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ,+ nke Jehova kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.+