45 E dere n’akwụkwọ ndị amụma, sị, ‘Ha niile ga-abụkwa ndị Jehova kụziiri ihe.’+ Onye ọ bụla nke nụrụ ihe site n’ọnụ Nna m ma mụta ihe na-abịakwute m.+
14 Otu nwaanyị aha ya bụ Lidia, onye na-ere ákwà na-acha odo odo, onye obodo Tayataịra,+ onye na-efekwa Chineke, nọkwa na-ege ntị. Jehova wee meghee nnọọ obi+ ya ịnabata ihe Pọl nọ na-ekwu.