16 ka onye ọ bụla nke na-agọzi onwe ya n’ụwa wee jiri Chineke nke okwukwe gọzie onwe ya,+ ka onye ọ bụla nke na-aṅụkwa iyi n’ụwa wee jiri Chineke nke okwukwe ṅụọ iyi;+ n’ihi na ha ga-echefu ahụhụ niile ha tara n’oge gara aga, n’ihi na a ga-ezopụ ha n’anya m.+
24 “Ma, ka onye na-anya isi nyaa isi na o nwere nghọta+ banyere m, marakwa m, na mụ onwe m bụ Jehova,+ Onye na-egosi obiọma,* na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ụwa;+ n’ihi na ọ bụ ihe ndị a na-atọ m ụtọ,”+ ka Jehova kwuru.