5 Unu ajụla inye ya ibe unu,+ ọ gwụla ma ùnu kwekọrịtara maka oge a kara aka,+ ka unu wee tinye oge n’ikpe ekpere wee nọkọọ ọzọ, ka Setan wee ghara ịnọ na-anwa unu ọnwụnwa+ maka na unu enweghị ike ịchịkwa onwe unu.+
2 N’ihi na anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu,+ ọ bụ onye zuru okè,+ nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.