7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị agọziwo gị n’ihe niile aka gị na-eme.+ Ọ maara nke ọma banyere njegharị ị na-ejegharị ná nnukwu ala ịkpa a. Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị afọ iri anọ ndị a.+ Ọ dịghị ihe kọrọ gị.”’+
8 Chineke nwekwara ike ime ka obiọma ya dum nke na-erughịrị mmadụ dị ukwuu n’ebe unu nọ, ka unu wee nwee ihe bara ụba maka ezi ọrụ niile,+ ebe unu nwere ihe zuuru unu mgbe niile n’ihe niile.