9 ma, mgbe mụ na unu nọ, m wee nwee mkpa, abụrụghị m onye ọ bụla ibu arọ,+ n’ihi na ụmụnna ndị si Masedonia+ bịa wetara ihe dị ukwuu n’ihi ihe kọrọ m. Ee, n’ụzọ niile, emere m onwe m ka m ghara ịbụrụ unu ibu arọ, m ga-adịkwa otú a.+
8 anyị erighịkwa nri onye ọ bụla n’efu.+ Kama nke ahụ, site n’ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ nakwa ná ndọlị+ abalị na ehihie, anyị nọ na-arụ ọrụ ka anyị wee ghara ibo onye ọ bụla n’ime unu oké ibu arọ.+