13 Ihe ndị a ka anyị na-ekwukwa, anyị ejighị okwu e ji amamihe mmadụ+ kụzie na-ekwu ya, kama anyị ji okwu e ji mmụọ nsọ+ kụzie na-ekwu ya, na-ejikọta ihe ime mmụọ na okwu ime mmụọ.+
8 Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu+ unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma+ na aghụghọ efu,+ dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ+ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị;