19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya.+ Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa,+ kama ahọpụtara m unu n’ụwa, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.+
13 Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe,+ ọ bụ ezie na ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ,+ ma ha hụrụ ha n’ebe dị anya+ ma nabata ha ma kwusaa n’ihu ọha na ha bụ ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.+