16 Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke,+ ọ bara uru iji ya zie ihe,+ iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị,+ iji ya mee ka ihe guzozie,+ na iji ya nye ọzụzụ+ n’ezi omume,
6 O wee sị m: “Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu;+ ee, Jehova, bụ́ Chineke nke mere ka ndị amụma+ kwuo okwu site n’ike mmụọ nsọ,+ zigara mmụọ ozi ya igosi ndị ohu ya ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.+