3 Ee, ana m arịọkwa gị, ezigbo onye so m nyara yok,+ ka ị na-enyere ụmụ nwaanyị ndị a aka, bụ́ ndị mụ na ha gbakọrọ mbọ+ ọnụ n’ozi ọma, ha na Klement na ndị ọrụ ibe m ndị ọzọ,+ ndị aha ha+ dị n’akwụkwọ nke ndụ.+
27 Ma ihe ọ bụla na-adịghị nsọ na onye ọ bụla nke na-eme ihe arụ,+ nke na-aghakwa ụgha,+ agaghị abanye n’ime ya ma ọlị;+ ọ bụ naanị ndị e dere aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ ga-abanye n’ime ya.+