10 Atụla egwu banyere ihe ndị ị na-aga ịta ahụhụ ha.+ Lee! Ekwensu+ ga na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu,+ ka unu wee nweekwa mkpagbu+ ruo ụbọchị iri. Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ,+ m ga-enye gị okpueze bụ́ ndụ.+
13 ‘Amaara m ebe i bi, ya bụ, n’ebe ocheeze Setan dị; ma i jidesiri aha m ike,+ ị gọnahụghịkwa okwukwe i nwere n’ebe m nọ+ ọbụna n’ụbọchị Antipas, bụ́ onye àmà m,+ onye kwesịrị ntụkwasị obi, onye e gburu+ n’akụkụ unu, n’ebe Setan bi.