Job
18 Bildad onye si n’agbụrụ Shua wee zaa, sị:
2 “Olee mgbe unu ga-akwụsị okwu a unu na-ekwu?
Unu kwesịrị ịghọta, ka anyị kwutụkwanụ.
4 Ọ na-adọrisị mkpụrụ obi ya n’iwe ya.
À ga-ekwo gị gbahapụ ụwa,
Ka oké nkume ọ̀ ga-esi n’ebe ọ dị pụọ?
10 Ọ bụ n’ala ka e zoro ụdọ a ga-eji jide ya,
Ọ bụkwa n’ụzọ o si aga ka e siiri ya ọnyà.
13 Ọ ga-eri iberibe akpụkpọ ahụ́ ya;
Nwa mbụ nke ọnwụ ga-eri aka ya na ụkwụ ya.
14 A ga-esi n’ụlọikwuu ya wepụ ihe ahụ na-enye ya obi ike,+
Ọ ga-emekwa ka ọ zọrọ ije gakwuru eze nke ihe egwu.
18 Ha ga-esi n’ìhè kwaba ya n’ọchịchịrị,
Ha ga-achụpụkwa ya n’elu ala.
19 Ọ gaghị enwe ụmụ na ụmụ ụmụ n’etiti ndị ya,+
Ọ dịghịkwa onye ga-afọdụ ndụ n’ebe o bi dị ka mbịarambịa.
20 N’ụbọchị ya, ndị nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ga-ekporopụ anya,
Ọbụna ndị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ga na-ama jijiji.
21 Ma nke a bụ ihe na-eme ụlọikwuu nke onye na-eme ihe ọjọọ,
Nke a bụkwa otú ọ na-adị onye na-amaghị Chineke.”