35 ka ọbara ndị ezi omume niile e gburu* n’ụwa wee dị n’isi unu, malite n’ọbara Ebel onye ezi omume+ ruo n’ọbara Zekaraya nwa Barakaya, onye unu gburu n’agbata ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà.+
4 Ọ bụ okwukwe ka Ebel ji chụọrọ Chineke àjà ka nke Ken mma.+ Ọ bụkwa okwukwe ahụ mere e ji gbaara ya àmà na ọ bụ onye ezi omume n’ihi na Chineke nabatara onyinye ya.+ Ọ bụ eziokwu na ọ nwụrụ, ọ ka si n’okwukwe ya na-ekwu okwu.+