-
2 Ihe E Mere 24:20-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Mmụọ Chineke wee dakwasị Zekaraya nwa Jehoyada+ onye nchụàjà, ya eguzoro n’ihu ndị obodo ha, sị ha: “Ezi Chineke kwuru, sị, ‘Gịnị mere unu ji na-emebi iwu Jehova? Ihe agaghị agaziri unu. Ebe ọ bụ na unu ahapụla Jehova, ọ ga-ahapụkwa unu.’”+ 21 Ma, ha gbaara ya izu,+ eze agwa ha ka ha jiri nkume tụgbuo ya, ha atụgbuo ya n’ogige ụlọ Jehova.+ 22 Eze Jehoash echetaghị otú Jehoyada si gosi na ọ hụrụ ya n’anya, ya egbuo Zekaraya nwa ya. Mgbe Zekaraya nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ sịrị: “Ka Jehova kwụọ gị ụgwọ ihe a i mere.”+
-