20 Mmụọ+ Chineke wee kpuchie+ Zekaraya+ nwa Jehoyada+ onye nchụàjà, o wee guzoro n’ihu ìgwè mmadụ wee sị ha: “Nke a bụ ihe ezi Chineke kwuru, ‘Gịnị mere unu ji na-emebi ihe Jehova nyere n’iwu, nke ga-eme ka ihe ghara ịgaziri unu?+ Ebe ọ bụ na unu ahapụwo Jehova, ya onwe ya ga-ahapụ unu.’”+