-
Jenesis 12:8, 9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Mgbe e mechara, o si n’ebe ahụ kwaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Betel+ ma maa ụlọikwuu n’ebe ahụ. Betel dị n’ebe ọdịda anyanwụ ebe ahụ ọ mara ụlọikwuu, E-aị+ adịrị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ rụụrụ Jehova ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ, malitekwa ịkpọku aha Jehova.+ 9 E mechaa, Ebram kwaliri gawa n’ebe chere ihu na Negeb.*+ Ọ nọ na-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche iche ka ọ na-aga.
-