-
Jenesis 19:28, 29Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Mgbe o ledara anya lee Sọdọm na Gọmọra na ala niile dị n’ógbè ahụ, ihe ọ hụrụ tụrụ ya egwu. Nnukwu anwụrụ ọkụ si n’obodo ahụ na-akwụgo elu. Ọ dị ka nnukwu anwụrụ ọkụ si ná nnukwu ekwú.+ 29 Mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị n’ógbè ahụ, Chineke chetara Ebreham wee mee ka Lọt pụọ n’obodo ndị ahụ o bibiri, bụ́ ebe Lọt bibu.+
-