18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ.+ Ọ sịrị ya: “Ọ bụ ụmụ* gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo ná nnukwu osimiri, bụ́ osimiri Yufretis,+
7 Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe, onye si n’ụlọ nna m nakwa n’ala ndị ikwu m kpọrọ m,+ onye gwakwara m okwu ma ṅụọrọ m iyi,+ sị: ‘Ọ bụ ụmụ* gị+ ka m ga-enye ala a,’+ ga-ezite mmụọ ozi ya ka o butere gị ụzọ.+ Ị ga-esikwa n’ebe ahụ lụtara nwa m nwoke nwaanyị.+
33Jehova gwakwara Mosis, sị: “Si n’ebe a kwalie, gị na ndị a i dupụtara n’Ijipt. Gawanụ n’ala m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi, sị, ‘M ga-enye ya ụmụ* gị.’+